Job 29

Ngọpụ ikpeazụ Job

1Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:

2“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,
dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,
3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi
ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,
mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m
na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,
mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.

7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo
were ọnọdụ m nʼama.
8Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,
ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;
9ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu
ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;
10olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,
ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.
11Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,
ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.
12Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,
napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
13Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;
emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,
ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
15Abụ m anya nye onye ìsì,
bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;
bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,
si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.

18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,
na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
19Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,
na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.
20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,
ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’

21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,
ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.
Okwu m na-ada juu na ntị ha.
23Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,
na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.
24Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;
ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.
25Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;
ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya;
na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.
Copyright information for IboBIU